AISAIA 39:6 - Compare All Versions
AISAIA 39:6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka ONYENWE ANYị kwuru.
Kesaa
AISAIA 39 BIUAISAIA 39:6 IGBOB (Bible Nso)
Le, ubọchi nābia, na ihe nile di n'ulo-gi, na nke nna-gi-hà debeworo n'ulo-àkù rue ta, agēburu ha je Babilon: ọ dighi ihe gāfọdu, ka Jehova siri.
Kesaa
AISAIA 39 IGBOB