Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 31:1-9

AISAIA 31:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka, ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya, ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ, ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya. Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel; ha adịghị arịọkwa ya ka ONYENWE ANYị nyere ha aka. Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi. Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya. Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ; ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka. Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke! Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ. Mgbe ONYENWE ANYị setịpụrụ aka ya imegide ha, ha ga-asọ ngọngọ; ndị ha na-enyere aka ga-adakwa. Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi. Ma ihe ndị a ka ONYENWE ANYị gwara m, “Dịka ọdụm na-agbọ ụja, na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu, nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụ imegide ya, ọ naghị atụ egwu mkpu ha, mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu, Otu a kwa, ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdata ibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile. Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya, otu a ka mụ bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem, ọ ga-ekpuchi ya napụta ya, ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.” Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide. Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ. “Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ, mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha. Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ, ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye. Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu, ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.” Otu a ka ONYENWE ANYị kwubiri ya. Onye ọkụ ya dị na Zayọn, onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.

AISAIA 31:1-9 Bible Nso (IGBOB)

Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova! Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe. Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi. N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha. Dika umu-nnunu nēfe efe, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi Jerusalem; nēb͕ochi nānaputa; nāgabiga nēme ya ka o wepuga onwe-ya. Laghachikutenu Onye ahu Nke umu Israel siri n'aka-Ya wezuga onwe-ha nke-uku. N'ihi na n'ubọchi ahu ha gāju, onye ọ bula ọ ju ihe-efu ọla-ọcha ya nile na ihe-efu ọla-edo ya nile, nke aka-unu mere nye onwe-unu, ibu nmehie. Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè. Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.