AISAIA 30:1-2
AISAIA 30:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ahụhụ ga-adịrị ụmụ ndị nnupu isi,” otu a ka ONYENWE ANYị kwupụtara, “bụ ndị na-agbaso nzube nke na-esiteghị nʼaka m, ndị ha na ndị ọzọ na-agba ndụ nke Mmụọ m na-anabataghị, si otu a na-eme ka mmehie na-aba ụba nʼelu mmehie. Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.
Kesaa
Gụọ AISAIA 30AISAIA 30:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie: ndi nēje irida n'Ijipt, ma ha ajughi ase n'ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n'ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt!
Kesaa
Gụọ AISAIA 30