AISAIA 2:6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
AISAIA 2:6 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.
AISAIA 2:6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gị, bụ ONYENWE ANYị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.