Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 16:1-14

AISAIA 16:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke Ada Zayọn. Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid, bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume. Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ. Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara Moab akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset. Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri. Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres. Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha. Ihe ndị a niile bụ okwu ONYENWE ANYị kwuru banyere Moab na mbụ, ma ugbu a ONYENWE ANYị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

AISAIA 16:1-14 Bible Nso (IGBOB)

Sinu na Sela n'uzọ ọzara zigara onye nāchi ala umu-aturu, rue ugwu ada Zaion. O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon. Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari. Ka ndim achupuru achupu nọ dika ọbìa n'etiti gi; Moab, ghọrọ ya ebe nzuzo izopu ya n'iru onye nāpunara ya ihe: n'ihi na onye-nkpab͕u nwere ọgwugwu, ihe-ike agwusiwo, ndi nāzọda madu agwuchapuwo n'ala. Agēme kwa ka otù oche-eze guzosie ike n'ebere, otù onye gānọkwasi kwa ya n'ezi-okwu, n'ulo-ikwū Devid; bú onye nēkpe ikpe, nāchọ kwa ikpé ziri ezi, nēme kwa ngwa ime ezi omume. Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu. N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe. N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri. N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo. Ewepuwo kwa ọṅù na iteghari-egwú-ọǹù n'ubi ọma; agaghi-eti kwa nkpu ọṅù tisie ya ike n'ubi-vine nile: onye-nzọcha agaghi-azọchaputa manya-vine n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile; emewom ka iti-nkpu nzọcha-nkpuru-vine kwusi. N'ihi nka ngiri-afọm nādara Moab udà dika ubọ-akwara, ime-afọm nāda-kwa-ra Kia-heres. O gēru kwa, mb͕e o mere ka ahu ya, mb͕e ike gwuru ya, bú Moab, n'elu ebe-ya di elu, mb͕e ọ gābiaru ebe nsọ ya ikpe ekpere, na ọ gaghi-enwe ike. Nka bu okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Moab na mb͕e gara aga. Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N'arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.