Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 10:5-19

AISAIA 10:5-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

“Ahụhụ ga-adịrị Asịrịa onye bụ mkpara nke iwe m. Nʼaka ya ka mkpọ nke ọnụma m dị. Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke, m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe, ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike, nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ. Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere, nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya; o zubere ịla ndị m nʼiyi, na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche. Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’ ‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish? Hamat ọ dịghị ka Apad; Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs? Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị, alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria. Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ” Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. Nʼihi na ọ na-asị, “ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m. Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ, ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe? Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu, maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ ONYENWE ANYị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere. Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ. A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ nʼiyi kpamkpam, dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi. Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.

AISAIA 10:5-19 Bible Nso (IGBOB)

Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem! Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí. Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba. N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze? Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs? Dika akam chọtaworo ala-eze nile nke ihe-efu, ndi arusi-ha apiri api kariri nke Jerusalem, kari kwa nke Sameria; dika m'meworo Sameria, me kwa ihe-efu-ya nile, ọ̀ bughi otú a ka m'gēme Jerusalem, me kwa ihe-efu-ya nile? Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya. N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze; akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe. Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi. N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku. Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n'otù ubọchi. Ọ gēme kwa nsọpuru nke oké ọhia-ya na nke ubi ọma ya ka ọ gwusia, ma nkpuru-obi ma anu-aru: ọ gādi kwa ka ọtita-aru nke onye-ọria. Ma osisi nke fọduru n'oké ọhia-ya gādi ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, nwata gēdeta kwa ha n'akwukwọ.