Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

AISAIA 1:18-20 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

AISAIA 1:18-20 IGBOB (Bible Nso)

Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe Jehova nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi. Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri: ma ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

AISAIA 1:18-20 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe ONYENWE ANYị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe, a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.” Nʼihi na ọnụ ONYENWE ANYị ekwula ya.