HOSEA 7:4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
HOSEA 7:4 IGBOB (Bible Nso)
Ha nile bu ndi nākwa iko; ha di ka ite-ọku uku nke osi-ite meworo ka ọ di ọku; ọ kwusiri ikpọnwu site na mb͕e edoziri utu ọka flour agwọrọ agwọ rue mb͕e emere ka o ko eko.
HOSEA 7:4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.