HOSEA 14:1-9
HOSEA 14:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Lọghachikwutenụ ONYENWE ANYị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute ONYENWE ANYị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” “Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ ONYENWE ANYị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
HOSEA 14:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Israel, laghachikute Jehova, bú Chineke-gi; n'ihi na i suwo ngọngọ site n'ajọ omume-gi. Chirinu okwu n'aka-unu laghachikute Jehova: sinu Ya, Bupu ajọ omume nile ayi, nara ezi ihe: ayi ewe kwughachi eb͕ub͕ere-ọnu-ayi, dika oke-ehi. Asiria agaghi-azọputa ayi; ọ bughi n'elu inyinya ka ayi gānọkwasi: ayi agaghi-asi kwa ọlu aka-ayi ọzọ, Chi-ayi ka unu bu: n'ihi na ọ bu nime Gi ka nwa-nb͕ei nāchọta obi-ebere. M'gāgwọ ndaghachi-azu-ha, M'gāhu ha n'anya n'afọ-ofufo: n'ihi na iwem esiwo n'aru ya chigharia. M'gādiri Israel dika igirigi, ọ gāma ifuru dika urodi, b͕asa nkpọrọgwu-ya nile dika Lebanon. Ome-ya nile gāwasa, ima-nma-ya gādi kwa ka osisi olive, ísì ọma o nēsì gādi ka Lebanon. Ndi bi n'okpuru ǹdò-ya gālata, me ka ọka di ndu, ha gāma ifuru dika osisi vine: ihe-ncheta-ya gādi ka manya-vine nke Lebanon. Efraim gāsi, Gini ka mu na arusi di iche iche nwekọrọ ọzọ? Mu onwem azawo, M'gēlegide kwa ya anya: mu onwem di ka osisi di ndu; esi nam chọta nkpuru-gi. Ònye bu onye-amam-ihe? ọ gāghọta kwa ihe ndia; ònye bu onye-nghọta? ọ gāma kwa ha. N'ihi na uzọ nile nke Jehova ziri ezi, ndi ezi omume gēje kwa ije nime ha; ma ndi-njehie gāsu ngọngọ nime ha.