Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

HOSEA 13:4-6 - Compare All Versions

HOSEA 13:4-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Ma mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị na Chineke gị, siterịị nʼala Ijipt. Unu agaghị anabatara onwe unu Chineke ọzọ karịa m. Ọ dịghị Onye nzọpụta ọzọ dị karịa m. Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m.

HOSEA 13:4-6 IGBOB (Bible Nso)

Ma Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, site n'ala Ijipt; ọ dighi kwa chi, ma-ọbughi náním, i gāmara, onye-nzọputa adighi kwa, ma-ọbughi náním. Mu onwem mara gi n'ọzara, n'ala kpọrọ oké nku. Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.