NDI-HIBRU 7:11-28
NDI-HIBRU 7:11-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn? Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu. Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja. E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso. Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja. Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma. Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha. Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.
NDI-HIBRU 7:11-28 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di? N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa. N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya. N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya. Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di, Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n'iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di: n'ihi na anāb͕ara Ya àmà, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di. N'ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n'iwu ghara idi irè n'ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya, (n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso. Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi, (n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi); ọ bu kwa n'uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma. Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n'ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide: ma Ya onwe-ya, n'ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ. O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha. N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile; Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n'ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n'ihi nmehie nile nke ndi Israel: n'ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà. N'ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n'azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.