NDI-HIBRU 7:1-28
NDI-HIBRU 7:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Melkizedek a bụ eze Salem, bụrụkwa onye nchụaja Chineke Onye kachasị ihe niile elu. Ọ zutere Ebraham mgbe o si na mmeri o meriri ọtụtụ ndị eze ahụ na-alọghachi, gọziekwa ya. Ebraham nyekwara ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile. Ihe mbụ aha ya pụtara bụ, “eze ezi omume,” ọzọkwa bụ “eze nke Salem,” nke pụtara, “eze udo.” O nweghị nna, o nwekwaghị nne, nke ọ na-enwe agbụrụ. O nweghị mmalite nke ụbọchị a mụrụ ya, maọbụ ọgwụgwụ ndụ, e mere ya dị ka Ọkpara Chineke. Ọ na-anọgide bụrụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi. Leenụ otu o siri bụrụ onye dị ukwuu, ọ bụladị Ebraham bụ nna nna anyị nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼihe ọ kwatara nʼagha! Ma otu ọ dị, iwu kwadoro ka ụmụ Livayị bụ ndị ghọrọ ndị nchụaja na-anakọta otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼaka ndị ọzọ, ya bụ, site nʼaka ndị ụmụnna ha ndị Izrel, nʼagbanyeghị na ụmụnna ha ndị ahụ bụkwa ụmụ ụmụ Ebraham. Ma nwoke a bụ onye na-esiteghị nʼagbụrụ naara otu ụzọ nʼụzọ iri site nʼaka Ebraham ma gọziekwa ya bụ onye ahụ nke natara nkwa ahụ. O nweghị ịrụrịta ụka ọbụla dị ya, na onye dị ukwuu na-agọzi onye dị nta. Nʼotu aka ahụ, ndị na-anata otu ụzọ nʼụzọ iri bụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nʼaka nke ọzọ, onye na-anata ya bụ onye ahụ e kwupụtara na ọ na-adị ndụ. Mmadụ pụrụ isi na Livayị onye natara otu ụzọ nʼụzọ iri kwụrụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke ya site nʼaka Ebraham. Nʼihi na mgbe Melkizedek zutere ya, ọ ka nọ nʼafọ nna nna ya. Ọ bụrụ na a pụrụ ime ka mmadụ zuo oke site nʼọnọdụ ndị nchụaja ndị Livayị, nʼihi na ọ bụ site nʼiwu e nyere ndị mmadụ ka e ji hiwee ọnọdụ ndị nchụaja. Olee uru ọ bara ka onye nchụaja ọzọ bịa, dị ka usoro Melkizedek si dị, na-abụghị dị ka usoro nke Erọn? Ebe a gbanwere ọnọdụ ndị nchụaja, nʼotu aka ahụ, a ghaghị ịgbanwekwa iwu. Nʼihi na onye ahụ e kwuru ihe ndị a banyere ya sitere nʼagbụrụ ọzọ, nke ọ dịbeghị onye ọbụla sitere na ya rụrụ ọrụ dị nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ ihe a mara nke ọma na Onyenwe anyị si nʼagbụrụ Juda pụta, Mosis nʼonwe ya akpọtụghị agbụrụ ahụ aha mgbe ọ na-ekwu banyere ndị nchụaja. E meela ka a ghọta okwu anyị na-ekwu nke ọma, mgbe onye nchụaja ọzọ yiri Melkizedek pụtara. Onye ghọrọ onye nchụaja ma ọ bụghị site nʼusoro iwu nke ọmụmụ ndị nchụaja, kama site nʼike dị na ndụ nke na-apụghị ịla nʼiyi. Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” Nʼotu aka ahụ, e wezugala usoro iwu ochie ahụ nʼihi adịghị ike ya na nʼihi abaghị uru ya (nʼihi na iwu ahụ emeghị ka ihe ọbụla zuo oke), ma nʼaka nke ọzọ, e webatala olileanya ka mma, bụ nke anyị na-esite na ya bịaruo Chineke nso. Ma e ji ịṅụ iyi mee ka ọnọdụ onyeisi nchụaja a guzosie ike. O nweghị iyi a ṅụrụ mgbe ndị ọzọ ghọrọ ndị nchụaja. Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Nʼihi nke a, Jisọs aghọọla onye na-akwagide ọgbụgba ndụ ka mma. Ihe ọzọ, ndị nchụaja nke ochie ahụ dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nʼihi na ọnwụ gbochiri ha ịga nʼihu nʼọrụ ha. Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha. Ya mere, ọ dị mkpa na anyị ga-enwe onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye dị nsọ, na onye na-enweghị ntụpọ, na onye dị ọcha, na onye e kewapụrụ site nʼebe ndị mmehie nọ, ma buliekwa ya elu karịa nʼeluigwe. Ọ dịghị ka ndịisi nchụaja ndị ọzọ, nʼihi na ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja kwa ụbọchị, nʼihi mmehie nke aka ya, na nʼihi mmehie nke ndị ọzọ. Naanị otu aja nke dịrị mgbe niile ka ọ chụrụ maka mmehie mgbe o weere onwe ya nye dị ka aja. Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi.
NDI-HIBRU 7:1-28 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na Melkizedek nka, eze Selem, onye-nchu-àjà nke Chineke Onye kachasi ihe nile elu, onye zutere Abraham mb͕e o si n'ob͕ub͕u ndi-eze ahu laghachi, we gọzie ya, onye Abraham kè-kwa-ra otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile nye, (ebe ọ bu mbu, ma asugharia aha-ya, Eze nke ezi omume, buru kwa ma emesia Eze nke Selem, nke bu, Eze nke udo; enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile. Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n'uzọ iri n'isi ihe alutara n'agha. Ọ bu kwa ezie na ndi ahu ndi si n'etiti umu Livai puta ndi nānara ọlu onye-nchu-àjà nwere ihe enyere n'iwu inara ndi Israel otù uzọ n'uzọ iri dika iwu-ha si di, nke ahu bu, inara umu-nne-ha, ọ bu ezie na ha esiwo n'afọ Abraham puta: ma onye ahu nke anēsiteghi na ha gu akukọ osuso-ọmumu-ya anarawo Abraham otù uzọ n'uzọ iri, gọzi kwa onye nwere nkwa ndia. Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà. Ọzọ, n'ebe a madu ndi nānwu anwu nānata otù uzọ n'uzọ iri; ma n'ebe ahu otù onye nānata ha, nke anāb͕ara ya àmà na ọ di ndu. Agēkwu otú a, na ọbuná Livai, onye nānata otù uzọ n'uzọ iri, na o site-kwa-ra n'aka Abraham nye otù uzọ n'uzọ iri; n'ihi na ọ nānọ n'aha nna-ya n'oge ahu, mb͕e Melkizedek zutere ya. Ya mere ọ buru na ewere ọnọdu ndi-nchu-àjà ndi Livai me ka madu zue okè (n'ihi na ndi Israel anatawo iwu n'okpuru ya), nkpà gini ọzọ di ka onye-nchu-àjà di iche bilie dika usoro Melkizedek si di, ka aghara kwa igu ya dika usoro Eron si di? N'ihi na ebe enyeworo ọnọdu ndi-nchu-àjà ahu, ọ di nkpà ka ọdida nke iwu puta kwa. N'ihi na Onye ahu anēkwu ihe ndia bayere Ya eketawo òkè n'ebo di iche, nke ọ dighi onye ọ bula nyeworo aka n'ebe-ichu-àjà site na ya. N'ihi na ọ putawo ìhè na Onye-nwe-ayi esiwo na Juda rọputa; bú ebo nke Moses nēkwughi ihe ọ bula bayere ndi-nchu-àjà nye ya. Ihe ayi nēkwu aputabigawo kwa ìhè ókè nke-uku kari, ma ọ buru na Onye-nchu-àjà di iche ebilie dika oyiyi Melkizedek si di, Onye emeworo Ya ka Ọ buru onye-nchu-àjà, ọ bughi dika iwu nke ihe enyere n'iwu nye anu-aru si di, kama dika ike nke ndu nādighi-agwu agwu si di: n'ihi na anāb͕ara Ya àmà, si, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di. N'ihi na emere ka ihe eburu uzọ nye n'iwu ghara idi irè n'ihi adighi-ike-ya na abaghi-urù-ya, (n'ihi na iwu ahu emeghi ihe ọ bula ka o zue okè), ewe webata olile-anya ka nma, nke ayi ji biaru Chineke nso. Otú ọ dighi kwa ma ejighi iṅu-iyi, (n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi); ọ bu kwa n'uzọ ra otú a ka emeworo Jisus ka Ọ buru onye-ala ebe nke ọb͕ub͕a-ndu ka nma. Ọ bu kwa ezie na emewo ndi ahu ka ha buru ndi-nchu-àjà riri nne, n'ihi na ọnwu nēb͕ochi ha inọgide: ma Ya onwe-ya, n'ihi na Ọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi, O nwere ọnọdu-onye-nchu-àjà-Ya nādighi-agabiga onye ọzọ. O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha. N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile; Onye ọ nādighi Ya nkpà kwa-ubọchi, dika ndi-isi-nchu-àjà ahu, ichu àjà di iche iche, mbu n'ihi nmehie nile nke aka ya, emesia n'ihi nmehie nile nke ndi Israel: n'ihi na nka ka O mere nání otù mb͕e, mb͕e Ọ churu Onwe-ya dika àjà. N'ihi na iwu nēdo madu ndi-isi-nchu-àjà, ndi nādighi ike; ma okwu nke iṅu-iyi ahu, nke soro iwu ahu n'azu, nēdo Ọkpara, Onye emeworo Ya ka O zue okè rue mb͕e ebighi-ebi.