Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI-HIBRU 6:18-19 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NDI-HIBRU 6:18-19 IGBOB (Bible Nso)

ka ayi we were ihe abua nādighi-agha, nke Chineke nāpughi ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi, bú ndi b͕abàra ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n'iru ayi; bú olile-anya nke ayi nwere dika ihe njiko nke nkpuru-obi, nke bu ihe-ntukwasi-obi na ihe nēguzosi ike, nke nābà kwa nime ebe ahu nke di nime ákwà-nb͕ochi

NDI-HIBRU 6:18-19 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ka ọ ga-abụ site nʼihe abụọ na-enweghị mgbanwe, nke na-agaghị ekwe omume izi Chineke dịka onye ụgha, anyị bụ ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta agbamume siri ike iji jide olileanya e dobeere anyị. Anyị nwere olileanya a dị ka arịlịka nke mkpụrụobi nke guzosiri ike ma bụrụkwa nke e chekwara. Ọ na-abanye nʼime ime ebe nchụaja ahụ nʼazụ akwa mgbochi