NDI-HIBRU 3:8-11 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI-HIBRU 3:8-11 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
unu emela ka obi unu sie ike, dị ka unu mere nʼoge nnupu isi mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara, ebe nna nna unu ha nọrọ nwa m ọnwụnwa. Ọ bụ ezie na ha hụrụ akaọrụ m iri afọ anọ ndị a. Nʼihi nke a, ewere m iwe megide ọgbọ ahụ. Asịrị m, ‘Obi ha na-akpafu akpafu mgbe niile. Ha amatabeghị ụzọ m niile.’ Ya mere, aṅụrụ m iyi nʼiwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
Kesaa
NDI-HIBRU 3 BIUNDI-HIBRU 3:8-11 IGBOB (Bible Nso)
Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu, Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia, Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem, Hu kwa ọlum ọgu arọ abua. N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a, M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha: Ma ndi ahu amaghi uzọm nile; Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.
Kesaa
NDI-HIBRU 3 IGBOB