JENESIS 9:20-29
JENESIS 9:20-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Noa, onye ọrụ ubi, bidoro ịkụ ubi vaịnị a gbara ogige. Mgbe ọ ṅụrụ mmanya si nʼubi a, ṅụbiga ya oke, ọ gbaara ọtọ dinaa ala nʼime ụlọ ikwu ya. Ham, nna Kenan, hụrụ ọtọ nna ya, gaa kọọrọ ụmụnne ya abụọ nọ nʼezi ihe ọ hụrụ. Ma Shem na Jafet weere akwa tụkwasị nʼubu ha, were azụ jere ije ruo nʼebe nna ha nọ, hapụ akwa ahụ ka ọ dakwasị nna ha kpuchikwaa ọtọ ya. Ma ha chepuru ihu nʼebe ọzọ mgbe ha na-eme nke a, nʼihi ya, ha elekwasịghị ọtọ nna ha anya. Mgbe Noa si nʼụra mmanya ya bilie, chọpụta ihe nwa ya nwoke nke nta mere, o kwuru sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka Kenan bụ! Ohu ndị ohu, ka ọ ga-abụrụ ụmụnne ya.” Ọ sịkwara, “Ngọzị dịrị ONYENWE ANYị Chineke Shem. Ka Kenan bụrụ ohu Shem. Ka Chineke mee ka ebe obibi Jafet saa mbara, ka Jafet biri nʼụlọ ikwu Shem, meekwa ka Kenan bụrụ ohu ya.” Mgbe uju mmiri ahụ gabigachara, Noa biri ndụ narị afọ atọ na iri afọ ise ọzọ. Ọnụọgụgụ afọ Noa niile mgbe ọ nwụrụ, bụ narị afọ itoolu na iri afọ ise.
JENESIS 9:20-29 Bible Nso (IGBOB)
Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine: ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya. Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí. Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha. Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya. Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom. Ọ si kwa, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu; Ka Kenean ghọkwara ha orù. Ka Chineke me ka Jefet setia, Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem; Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù. Noa we di ndu, mb͕e iju-miri ahu gasiri, ọgu arọ iri-na-asa na arọ iri. Ubọchi nile nke Noa we buru nnù arọ abua na ọgu asa na iri: o we nwua.