Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 49:1-33

JENESIS 49:1-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, Jekọb kpọkọtara ụmụ ya ndị ikom niile nʼotu sị ha, “Zukọọnụ ka m gwa unu ihe ga-adakwasị unu nʼụbọchị dị nʼihu. “Zukọọnụ nụrụ, ụmụ ndị ikom Jekọb nụrụ okwu nna unu Izrel. “Ruben, ọkpara m ka ị bụ, ume m, ihe ngosi mbụ nke ike m, onye nsọpụrụ kwesiri, onye mbụ nʼịdị ike. Onye na-agbanwe agbanwe dịka mmiri dị nʼiyi, ị gaghị abụkwa onye mbụ, nʼihi na ị banyere nʼihe ndina nna gị, i dinara nʼihe ndina m, merụọ ya. “Simiọn na Livayị bụ ụmụnne. Mma agha ha bụ ngwa ihe ike. Ka obi m ghara isonye nʼizuzu ha, ka m ghara isonye nʼọgbakọ ha, nʼihi na ha gburu mmadụ nʼoge iwe ha, bipụkwa nkwonkwo ụkwụ ụmụ ehi na-echeghị echiche. Ihe a bụrụ ọnụ ka iwe ha bụ, nʼihi na ọ dị njọ. Ọnụma ha, ọ jọbigara njọ oke. Aga m ekesa ha nʼetiti ụmụ Jekọb Kpasaa ha nʼetiti ndị Izrel. “Gị, Juda, ụmụnne gị ga-eto gị. Aka gị ga-adị nʼolu ndị iro gị. Ụmụ ndị ikom nna gị ga-akpọ isiala nye gị. Ị bụ nwa ọdụm, gị, Juda, i si nʼịchụ nta lọta, nwa m. Dịka ọdụm, ọ na-amakpu, na-edina ala, dịka nne ọdụm, onye ga-anwa anwa kpọtee ya? Mkpanaka eze agaghị esite nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya, maọbụ mkpanaka onyendu esi nʼagbata ụkwụ ya pụọ, tutuu ruo mgbe eze ahụ nwe ya ga-abịa, irube isi nke mba niile ga-abụ nke ya. Ọ ga-ekenye ịnyịnya ibu ya nʼosisi vaịnị, nʼalaka kachasị mma ka ọ ga-ekenye nwa ịnyịnya ibu ya. Ọ ga-asakwa uwe ya na mmanya. Uwe mwụda ya ka ọ ga-asụkwa nʼọbara mkpụrụ vaịnị. Anya ya ga-acha uhie uhie karịa mmanya vaịnị. Eze ya ga-enwupụkwa ọcha karịa mmiri ara ehi. “Zebụlọn ga-ebi nʼakụkụ osimiri. Ọ ga-abụ ebe izuike nye ụgbọ mmiri. Oke ala ya ga-agbatịpụ ruo Saịdọn. “Isaka dị ike dịka ịnyịnya ibu na-amakpu nʼetiti ọgba atụrụ. Mgbe ọ hụrụ otu ebe izuike ya si dị mma, hụ otu ala ya si maa mma, ọ ga-ehudata isi ya ibu ibu arụ; were onwe ya nye ịrụ ọrụ ike. “Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel. Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ. “O ONYENWE ANYị, ana m ele anya nnapụta gị. “Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ. “Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma. “Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma. “Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị. Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị. Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel, nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa. Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya. “Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.” Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya. Emesịa, o nyere ha ndụmọdụ sị ha, “Nʼoge na-adịghị anya site ugbu a, aga m anwụ. Unu aghaghị ili m nʼebe e liri nna m ha, nʼala Kenan, nʼime ọgba ahụ dị nʼọhịa Efrọn, onye Het. Nʼime ọgba dị nʼọhịa Makipela, nke dị nso na Mamre, nʼala Kenan, ọhịa Ebraham zụtara site nʼaka Efrọn onye Het, maka ili ozu. Nʼebe ahụ ka e liri Ebraham na Sera nwunye ya. Nʼebe ahụ kwa ka e liri Aịzik na Ribeka nwunye ya. Nʼebe ahụ ka m liri Lịa. Ebraham nna nna m zụrụ ala ahụ na ọgba dị nʼime ya site nʼaka ụmụ Het.” Mgbe Jekọb kwuchara okwu ndụmọdụ ikpeazụ ndị a nye ụmụ ya ndị ikom, ọ chịkọtara ụkwụ ya nʼelu akwa, kuo ume ikpeazụ. A chịkọtara ya na ndị ya.

JENESIS 49:1-33 Bible Nso (IGBOB)

Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia. Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob; Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu. Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem; Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike. I nāb͕oghari dika miri, akarila akari; N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi: Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem. Simeon na Livai bu nwa-nne; Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha. Abala n'ìzù-ha, nkpuru-obim; Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum; N'ihi na n'iwe-ha ka ha b͕uru nwoke, Ọ bu kwa n'ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi. Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel. Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi: Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi; Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi. Nwa-ọdum ka Juda bu; N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo; O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum, Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie? Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche. O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine, O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma; Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine, Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine: Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine, Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi. Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi: Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o. Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon. Isaka bu inyinya-ibu di ike, Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua: Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma, Hu kwa ala ahu, na ọ di uto; Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu, We ghọ onye nēfè òfùfè orù. Dan gēkpeputa ndi-ya, Dika otù nime ebo nile nke Israel. Ka Dan buru agwọ n'uzọ, Aju-ala n'okporo-uzọ, Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru, Onye o nēbu we daghachi azu. Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya: Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu. Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya, Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze. Naftali bu nne-ele arapuworo arapu: Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ. Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu, Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi; Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi. Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú, B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì: Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike, Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume, Site n'aka Dike nke Jekob, (N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,) Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa. Ngọzi nile nke nna-gi Adiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murum Rue ókè nke ugwu ebighi-ebi: Ha gādi n'isi Josef, Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya. Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu: N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru, N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara. Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha. Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het, n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì: n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia: azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het. Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.