JENESIS 27:19-33 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
JENESIS 27:19-33 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.” Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ ONYENWE ANYị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.” Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.” Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.” Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya. Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.” Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya. Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.” Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị, “Nʼezie, isisi nwa m nwoke dịka isisi ala ubi nke ONYENWE ANYị gọziri. Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.” Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata. Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”
JENESIS 27:19-33 IGBOB (Bible Nso)
Jekob we si nna-ya, Mu onwem bu Isọ ọkpara-gi; emewom dika i gwaram: biko, bilie, nọdu, rie ufọdu n'anu m'chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. Aisak we si nwa-ya, Ì si kwa aṅa me ngwa ichọta ya, nwam? Ọ si, N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere ka o zutem. Aisak we si Jekob, Biko, bia nso, ka m'we bitu gi aka, nwam, ma gi onwe-gi bu nwam Isọ ahu, ma-ọbu na i bughi ya. Jekob we jekuru Aisak nna-ya nso; o bitu ya aka, si, Olu a bu olu Jekob, ma aka ndia bu aka Isọ. Ma ọ mataghi ya, n'ihi na aka-ya abua bu aji aji, dika aka Isọ nwa-nne-ya: o we gọzie ya. Ọ si, Gi onwe-gi, ì bu kwa nwam Isọ? Ọ si, Mu onwem bu ya. Ọ si, Buterem ya nso, ka m'ri kwa ufọdu nime anu nwam chutara, ka nkpuru-obim we gọzie gi. O we butere ya nso, o rie: o butekwara ya manya-vine, ọ nua. Aisak nna-ya we si ya, Biko, bia nso, sutum ọnu nwam. Ọ bia nso, sutu ya ọnu: o we nu ísi uwe-ya, gọzie ya, si, Le, ísì nwam Di ka ísi ọhia nke Jehova gọzi-woro: Ka Chineke nye gi ufọdu nime igirigi elu-igwe, Na ufọdu nime ebe di urù nke ala, Na ọka na manya-vine ọhu ri nne: Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi. O rue, mb͕e Aisak gọzisiri Jekob, mb͕e Jekob nọ kwa nāpù n'iru Aisak nna-ya ub͕u a, na Isọ nwa-nne-ya siri n'ichu-ntá-ya bata. Ya onwe-yasi-kwa-ra nri utọ, butere nna-ya, si nna-ya, Ka nnam bilie, rie ufọdu nime anu nwa-ya chutara, ka nkpuru-obi-gi we gọziem. Aisak nna-ya we si ya, Ònye ka i bu? Ọ si, Mu onwem bu nwa-gi, ọkpara-gi, bú Isọ. Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa.