JENESIS 2:16-17
JENESIS 2:16-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a, ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
Kesaa
Gụọ JENESIS 2JENESIS 2:16-17 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, bú Chineke, we nye madu ahu iwu, si, Nkpuru nke sitere n'osisi nile ọ bula nke ubi a ab͕ara ogige ka i ganēri eri: ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.
Kesaa
Gụọ JENESIS 2