Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

JENESIS 18:1-15

JENESIS 18:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie. O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala. Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị. Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a. Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.” Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.” Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri. Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri. Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.” Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu. Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa. Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?” ONYENWE ANYị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’ Ọ dị ihe nyịrị ONYENWE ANYị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”

JENESIS 18:1-15 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'etiti osisi terebinth nke Mamre, mb͕e ya onwe-ya nānọdu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū-ya n'ikpo-ọku nke ehihie; o welie anya-ya abua elu, hu, ma, le, ndikom atọ nēguzo onwe-ha na ncherita-iru ya: mb͕e ọ huru ha, o si n'ọnu-uzọ ulo-ikwū ahu b͕a ọsọ izute ha, ọ kpọ isi ala, si, Onye-nwem, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, esila n'ebe orù-gi nọ gabiga: biko, ka ekute nwantī miri, unu sa ukwu-unu, zuru-kwa-nu ike n'okpuru osisi a: ka m'weta kwa iberibe achicha, nwe-kwa-nu ume n'obi-unu; emesia gabi-ganu: n'ihi na ọ bu n'ihi nka ka unu gabigakutere orù-unu. Ha we si, Me otú a, dika i kwuru. Abraham we me ngwa ba n'ulo-ikwū-ya, bakuru Sera, si, Me ngwa, weta mb͕é utu ọka flour atọ, gwọ ya, me ob͕e achicha. Abraham we b͕aga n'ìgwè ehi ya, were nwa-ehi nke anu-aru-ya nākaghi aka nke di kwa nma, nye okorọbia nējere ya ozi; o me ngwa idozi ya. O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie. Ha si ya, Òle ebe Sera, bú nwunye-gi, nọ? Ọ si, Le, ọ nọ n'ulo-ikwū. Ọ si, Aghaghim ichigharikute gi dika mb͕e a n'arọ ọzọ; le kwa, Sera, bú nwunye-gi, gēnwe nwa-nwoke. Ma Sera nuru n'ọnu-uzọ ulo-ikwū, nke di n'azu ya. Ma Abraham na Sera ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ha nāgwu; ọ ghawori idiri Sera dika ọ nādiri ndinyom. Sera we chì ọchì nime onwe-ya, si, M'gēnwe ihe-utọ mb͕e m'kasiri nká, onye-nwem bu kwa agadi? Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m'gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi? Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke. Sera we gọ, si, Achighm ọchì; n'ihi na ọ nātu egwù. Ọ si, É-è; kama i chiri ọchì.