JENESIS 1:1-4
JENESIS 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa. Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ. Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara. Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
Kesaa
Gụọ JENESIS 1JENESIS 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa. Uwa we buru ihe tọb͕ọrọ n'efu na ihe tọb͕ọrọ nkití; ọchichiri di kwa n'elu ob͕u-miri: Mọ Chineke nērughari kwa n'elu miri. Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di. Chineke we hu ìhè ahu, na ọ di nma: Chineke we kpa ókè n'etiti ìhè ahu na ọchichiri ahu.
Kesaa
Gụọ JENESIS 1