NDI GALETIA 2:1-3
NDI GALETIA 2:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe afọ iri na anọ gasịrị, ejeghachiri m Jerusalem ọzọ. Mụ na Banabas laghachiri Jerusalem, akpọkwara m Taịtọs jee. Agara m nʼihi mkpughe m nwere. Na nzukọ nzuzo nke m na ndị ndu nwere, akọwaara m ha ihe banyere oziọma nke m na-ekwusa nʼetiti ndị mba ọzọ. Nʼihi na-achọghị m ka ọrụ niile m rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ m na-arụ ugbu a, bụrụ ihe efu. Ọ bụladị Taịtọs onye mụ na ya so, o nweghị onye manyere ya ka e bie ya ugwu nʼagbanyeghị na ọ bụ onye Griik.
NDI GALETIA 2:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu mb͕e arọ iri na anọ gasiri arigorom na Jerusalem ọzọ, mu na Banabas, m'kpọrọ kwa Taitọs ka mu na ya yikọ je. Ma arigorom n'uzọ nkpughe; m'we debe n'iru ha ozi ọma ahu nke m'nēkwusa n'etiti ndi mba ọzọ, ma edeberem ya n'iru ndi akpọrọ ihe mb͕e ha nọ iche, ka m'ghara ibu onye nāb͕a ọsọ ma-ọbu onye b͕arari ọsọ n'efu n'uzọ ọ bula. Ma ọbuná Taitọs, onye mu na ya nọ, ebe ọ bu onye-Grik, erugideghi ya ka ebì ya úgwù