NDI GALETIA 1:6-10
NDI GALETIA 1:6-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O juru m anya, na unu esitela nʼebe onye ahụ kpọrọ unu site nʼamara Kraịst wezuga onwe unu, na-agbaso oziọma ọzọ, nke na-abụghị oziọma. O doro anya na ụfọdụ mmadụ na-etinye unu nʼọnọdụ mgbagwoju anya, mgbe ha na-agbalị ịgbanwe oziọma nke Kraịst. A sikwa na ọ bụ anyị onwe anyị maọbụ mmụọ ozi nke sitere nʼeluigwe bịara kwusaara unu oziọma ọzọ, nke dị iche na nke anyị bụrụ ụzọ kwusaara unu, ka onye dị otu a bụrụ onye abụrụ ọnụ. Dị ka anyị buru ụzọ kwuo ya na mbụ, ka m kwuokwa ya ọzọ: Ọ bụrụ na onye ọbụla na-ekwusara unu oziọma dị iche na nke ahụ unu nabatara, ka onye ahụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.
NDI GALETIA 1:6-10 Bible Nso (IGBOB)
Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche; nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist. Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n'elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide). Dika ayi kwuworo n'oge gara aga, anamekwu kwa ya ub͕u a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi nke unu natara, ya buru anathema (onye mmegide). N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.