Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZRA 6:22 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

EZRA 6:22 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ha sokwa mee mmemme achịcha na-ekoghị eko, nke ha mere ụbọchị asaa. Oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile nʼihi na ONYENWE ANYị mere ka eze Asịrịa nwee obiọma nʼebe Izrel nọ, nyere ha aka iwugharị ụlọnsọ ukwu Chineke, onye bụ Chineke Izrel.

EZRA 6:22 IGBOB (Bible Nso)

ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.