EZRA 1:1-4
EZRA 1:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu ONYENWE ANYị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, ONYENWE ANYị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, “Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘ONYENWE ANYị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ ONYENWE ANYị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha. Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ”
EZRA 1:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si, Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda. Ònye nọ n'etiti unu site na ndi-Ya nile? ka Chineke-ya nọyere ya, ya rigoru kwa Jerusalem, wue ulo Jehova, bú Chineke Israel, (Ya onwe-ya bu Chineke,) nke di na Jerusalem. Ma onye ọ bula nke fọduru afọdu, site n'ebe nile ebe onye ahu nọ dika ọbìa, ka ndikom nke ebe-ya were ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo, ya na onyinye-afọ-ofufo-ha nke diri ulo Chineke nke di na Jerusalem, yere ya aka.