EZIKIEL 45:9-10 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
EZIKIEL 45:9-10 IGBOB (Bible Nso)
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe.
Kesaa
EZIKIEL 45 IGBOBEZIKIEL 45:9-10 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwupụtara. Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
Kesaa
EZIKIEL 45 BIU