EZIKIEL 31:4-9
EZIKIEL 31:4-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri. Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta. Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya. Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu. Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
EZIKIEL 31:4-9 Bible Nso (IGBOB)
Miri mere ya ka o bùe ibù, ob͕u-miri mere ya ka ọ di elu: osimiri-ya nile nāga ebe-ya akuku ihe buruburu; uzọ-miri-ya nile ka o zigara osisi nile nke ọhia. N'ihi nka ka ogologo-ya di elu kari osisi nile nke ọhia; eme-kwa-ra ka ngalaba-ya ba uba, alaka-ya nile to-kwa-ra ogologo site n'ọtutu miri, mb͕e ọ waputara ha. Na ngalaba-ya nile ka anu-ufe nile nke elu-igwe luru akwu, ọ bu kwa n'okpuru alaka-ya nile ka anu ọhia nile muru umu, ọ bu kwa na ǹdò-ya ka oké mba nile biri. Ọ we ma nma n'idi-uku-ya, n'ogologo nke alaka-ya nile: n'ihi na nkpọrọgwu-ya adiwo n'ebe ọtutu miri di. Osisi cedar nile nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige ezoghi ya: osisi fir nile eyighi ngalaba-ya nile, osisi plane nile adighi kwa ka alaka-ya nile; ọ dighi kwa osisi ọ bula nke di n'ubi Chineke ab͕ara ogige nke yiri ya n'ima-nma-ya. Ihe nke mara nma ka M'mere ya ka ọ ghọ n'iba-uba nke alaka-ya: osisi nile nke Iden, nke di n'ubi Chineke nke ab͕ara ogige, we kwoso ya ekworo.