Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EZIKIEL 17:22-23 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

EZIKIEL 17:22-23 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị kwuru, Mụ onwe m ga-esi nʼọnụ ọnụ osisi kachasị mma nke osisi sida kachasị elu kụrụ ihe m ga-akụ. Aga m esi nʼọnụ ọnụ osisi sida dị elu kụrụ alaka dị nro, nke m ga-akụ nʼugwu dị ezigbo elu. Ọ bụ nʼelu ugwu niile nke Izrel ka m ga-akụnye ya. Ọ ga-awapụtakwa alaka ya, mịa mkpụrụ, bụrụkwa sida mara oke mma. Ụmụ nnụnụ dị iche iche ga-ewu akwụ ha na ya, ha ga-achọtakwa ebe obibi na ndo nke alaka ya niile.

EZIKIEL 17:22-23 IGBOB (Bible Nso)

Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n'ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n'ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M'gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n'elu ugwu di elu nke atuliri elu: n'ugwu nke ebe di elu nke Israel ka M'gāku ya: ọ gāwaputa kwa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi cedar mab͕uru onwe-ya: n'okpuru ya ka nnunu nile di iche iche gēbi; na ǹdò alaka-ya nile ka ha gēbi.