EZIKIEL 14:1-3
EZIKIEL 14:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịakwutere m, nọdụ ala nʼihu m. Mgbe ahụ okwu ONYENWE ANYị ruru m ntị, “Nwa nke mmadụ, ndị ikom ndị a na-efe arụsị nʼime obi ha, ma tinyekwa ihe ịsụ ngọngọ nke ajọ omume ya nʼihu ha. Aga m ekwenye ka ha jụta m ase ọbụla?
Kesaa
Gụọ EZIKIEL 14EZIKIEL 14:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Ufọdu nime ndi-okenye Israel we biakutem, nọdu ala n'irum. Okwu Jehova we ruem nti, si, Nwa nke madu, ndikom ndia emewo ka arusi nile ha ba n'obi-ha, ọ bu kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ha tiyere na ncherita-iru ha: #M'gēkwe ka ha juam ase ma-ọli?
Kesaa
Gụọ EZIKIEL 14