Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 9:1-9

ỌPUPU 9:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYị Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.” Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha, aka ONYENWE ANYị ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu. ONYENWE ANYị ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ” ONYENWE ANYị ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka ONYENWE ANYị ga-eme ihe dị otu a nʼala a.” Nʼụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYị mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero. Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.”