ỌPUPU 29:44-46 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌPUPU 29:44-46 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“E, aga m edo ụlọ nzute ahụ nsọ, ya na ebe ịchụ aja, na Erọn na ụmụ ya ndị ikom, ka ha na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Mgbe ahụ, aga m ebi nʼetiti ụmụ Izrel, bụrụkwa Chineke ha. Ha ga-amata na m bụ ONYENWE ANYị Chineke ha. Onye sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha, ka m si otu a biri nʼetiti ha. Abụ m ONYENWE ANYị Chineke ha.
Kesaa
ỌPUPU 29 BIUỌPUPU 29:44-46 IGBOB (Bible Nso)
M'gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M'gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà. M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gābu-kwa-ra ha Chineke. Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-ha, Nke mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ka M'we biri n'etiti ha: Mu onwem bu Jehova Chineke-ha.
Kesaa
ỌPUPU 29 IGBOB