ỌPUPU 21:7-8
ỌPUPU 21:7-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“A sị na nwoke eree nwa ya nwanyị dịka ohu, agaghị ala otu ndị ohu nwoke si ala. Ọ bụrụ na ihe nwanyị ahụ amasịkwaghị onyenwe ya, onye họọrọ ya nye onwe ya, onyenwe ya ga-ekwere ka a gbapụta ya. Ma ọ gaghị eresi ya ndị ọbịa. Nʼihi na onyenwe ya emeela nwanyị ahụ ihe ọjọọ mgbe ọ jụrụ na ọ gaghị alụkwa ya ọzọ.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 21ỌPUPU 21:7-8 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom. Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya.
Kesaa
Gụọ ỌPUPU 21