ỌPUPU 20:1-7
ỌPUPU 20:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke kwuru okwu ndị a niile sị: “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu. “Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m. Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu. Gị ejikwala aha ONYENWE ANYị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na ONYENWE ANYị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
ỌPUPU 20:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Chineke we kwue okwu ndia nile, si, Mu onwem bu Jehova Chineke-gi, Onye mere ka i si n'ala Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta. Gi enwela Chi ọzọ tiyerem. Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa: gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu. Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.