ESTA 9:1-5
ESTA 9:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị. Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche. Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai. Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile. Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha.
ESTA 9:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Ma n'ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n'ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì; ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n'obodo nile ha n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n'iru ha; n'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche. Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n'ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha. N'ihi na Mọdekai di uku n'ulo eze, akukọ-ya we nējezu n'ala nile anāchi achi: n'ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n'iru n'idi uku. Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n'iyì tib͕ue n'etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.