Mafee gaa na ọdịnaya

ESTA 7:9 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ESTA 7:9 IGBOB (Bible Nso)

Habona, bú otù onye nime ndi-onozi ndi nọ n'iru eze, we si, Le kwa, osisi ahu nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, nke Heman mere nye Mọdekai, bú onye kwuru ezi ihe bayere eze, o nēguzo n'ulo Heman. Eze we si, Kwubanu ya n'elu ya.

ESTA 7 IGBOB

ESTA 7:9 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, “Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe ọ chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman.” Eze sịrị, “Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!”

ESTA 7 BIU