Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

ESTA 7:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ESTA 7:7 IGBOB (Bible Nso)

Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.

Kekọrịta
ESTA 7 IGBOB

ESTA 7:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Eze biliri ọtọ nʼiwe, hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na ọ maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.

Kekọrịta
ESTA 7 BIU