Mafee gaa na ọdịnaya

ESTA 4:4-6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ESTA 4:4-6 IGBOB (Bible Nso)

Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha. Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka. Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze.

ESTA 4 IGBOB

ESTA 4:4-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha. Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a. Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze.

ESTA 4 BIU