ESTA 2:19-20
ESTA 2:19-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze. Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya.
Kesaa
Gụọ ESTA 2ESTA 2:19-20 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze. Esta adighi-egosi umu-nna-ya ma-ọbu ndi-ya; dika Mọdekai nyere ya iwu: n'ihi na ihe Mọdekai siri, nke ahu ka Esta nēme, dika mb͕e anāzùlite ya n'aka-ya.
Kesaa
Gụọ ESTA 2