ESTA 1:8 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ESTA 1:8 IGBOB (Bible Nso)
Ọṅuṅu-ihe ahu di ka iwu si di; ọ dighi onye nērugide erugide: n'ihi na otú a ka eze nyere onye uku ọ bula nke ulo-ya iwu, ime dika ọ tọrọ nwoke ọ bula utọ.
ESTA 1:8 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.