NDI EFESỌS 2:3-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NDI EFESỌS 2:3-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị niile bikwara ndụ anyị nʼetiti ha, nʼoge gara aga, na-emejupụta agụụ nke anụ ahụ mmehie, ma na-agbaso ọchịchọ ya na ebumnuche ya. Nʼihi na site nʼọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nʼọmụma ikpe ya. Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ
Kesaa
NDI EFESỌS 2 BIUNDI EFESỌS 2:3-4 IGBOB (Bible Nso)
ndi ayi onwe-ayi nile bi-kwa-ra obi n'etiti ha n'oge gara aga nime agu ihe ọjọ nke anu-aru-ayi, nēme ihe nile anu-aru-ayi na èchìchè-uche-ayi chọrọ, buru kwa umu nke iwe dika esi mu ayi, dika ndi fọduru bu kwa: ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi
Kesaa
NDI EFESỌS 2 IGBOB