EKLISIASTIS 5:1-20
EKLISIASTIS 5:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ. Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu. Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị? Aga m eme, aga m eme, ma e meghị ya bụ naanị okwu efu. Ya mere, tụọ egwu Chineke. Ọ bụrụ na ị hụ ebe a na-emegbu ndị ogbenye, na-anapụkwa ha ihe ruru ha site nʼikpe ikpe na-ezighị ezi na mpaghara obodo a na-achị achị, ya ejula gị anya, nʼihi na onyeisi ọbụla nwere onye na-atụrụ ya. Ndịisi na-atụ iwu nwekwara ndị kachasị ha elu. Otu a kwa, ọ dịkwa ndị dị elu karịa ha. Mgbe ihe nnweta si nʼala ubi bara ụba, ọ na-abara onye ọbụla uru; ọ na-abakwara eze nʼonwe ya uru. Onye ọbụla hụrụ ego nʼanya, ọ gaghị eju ya afọ. Onye ọbụla hụrụ akụnụba nʼanya adịghị enwe afọ ojuju nʼihe ọbụla. Nke a bụkwa ihe efu. Akụ na-abawanye, ndị na-eri ya na-abawanyekwa. Olee uru ha bara nye onyenwe ha karịa iji anya ya abụọ na-ele ha? Onye na-arụsị ọrụ ike na-arahụ ụra nke ọma, ma o riri nri nta ma o rikwaranụ nke dị ukwuu, ma oke iriju afọ onye ọgaranya anaghị ekwe ya rahụ ụra. Ahụrụ m ihe ọjọọ ọzọ nʼokpuru anyanwụ, mmadụ debere akụnụba ruo mgbe o wetara ya ihe mgbu, ma akụnụba ndị ahụ bụ ihe furu site nʼọdachi nke bụ na mgbe ha mụtara ụmụ, o nwekwaghị ihe fọdụrụ ụmụ ahụ iketa. Dịka mmadụ si gbara ọtọ site nʼafọ nne ya bata nʼụwa, otu a ka anyị ga-esi hapụ ya. O nweghị ihe ọ ga-ebu pụọ site na ndọgbu niile ọ dọgburu onwe ya nʼọrụ. Ma nke a bụ ihe ọjọọ nke na-egbu mgbu nʼobi. Mmadụ na-ala dịka o siri bịa. Gịnị bụ uru ya, mgbe ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nye ifufe? Ụbọchị ndụ ya niile, ọ na-eri ihe nʼọchịchịrị, site oke mgbagwoju anya, na nsogbu na iwe. Ma achọpụtara m na ọ bụ ihe dị mma na ihe kwesiri omume, ka nwoke rie ihe ma ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ Ka ọ chọtakwa afọ ojuju nʼime ndọgbu niile nke ọrụ ọ ruru nʼokpuru anyanwụ, nʼoge mkpụmkpụ ndụ nke Chineke nyere ya. Nʼihi na nke a bụ oke ya. Ọzọkwa, ọ bụrụ na Chineke enye mmadụ akụnụba na ihe nweta, ma nyekwa ya ike ọ ga-eji kporie ndụ nʼime ihe ndị a, ya nabata nke a dị ka oke ya ma were ọṅụ rụọ ọrụ ya. Ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. Ebe ọ bụ na Chineke enyela ya obi ụtọ, ụbọchị ndụ ya ekwesighị iwetara ya oke echiche.
EKLISIASTIS 5:1-20 Bible Nso (IGBOB)
Debe ukwu-gi mb͕e i nējeru ulo Chineke; n'ihi na ibiaru nso inu anu di nma kari ichu àjà ndi-nzuzu: n'ihi na ha adighi-ama na ha nēme ihe ọjọ. Ekwela ka ọnu-gi kwue okwu ọsọsọ, eme-kwa-la ka obi-gi me ngwa iweputa okwu n'iru Chineke; n'ihi na Chineke nọ n'elu-igwe, ma gi onwe-gi nọ n'elu-uwa: n'ihi nka me ka okwu-gi di ole-na-ole. N'ihi na nrọ abiawo n'ọtutu ije-ozi, olu onye-nzuzu kwa n'ọtutu okwu. Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya. Ọ di nma ka i ghara ikwe nkwa, kari ikwe nkwa ma i dighi-akwughachi. Ekwela ka ọnu-gi me anu-aru-gi ka o mehie; asi-kwa-la n'iru onye-ozi Chineke, na ọ bu n'amaghi-ama ka emere ya: n'ìhi gini ka Chineke gēwe iwe megide olu-gi, we mebie ọlu nke aka-gi abua? N'ihi na n'ọtutu nrọ na ihe-efu ka ọtutu okwu di kwa: ma tua egwu Chineke. Ọ buru na i hu na anēmeb͕u ob͕eye, na anānapu kwa ikpé ziri ezi na ezi omume n'ike n'ala anāchi achi, ibobo anwula gi n'ihe ahu anēme: n'ihi na otù Onye Nke di elu kari onye di elu nāriba ama; ndi di elu di kwa n'elu ha. Ọzọ, njubiga-ókè nke ala, ọra madu ka ọ diri: ọbuná eze ka ubi nēfè òfùfè. Onye nāhu ego n'anya, ego agaghi-eju ya afọ; ọzọ, onye nāhu inwe ihe bara uba n'anya, ihe onwunwe agaghi-eju ya afọ: nka bu kwa ihe-efu. Mb͕e ezi ihe nāba uba, ndi nēri ya abawo kwa uba: òle ngazi ọ nāgaziri onye-nwe-ya, ma-ọbughi iji anya-ya abua hu ya? Ihe utọ ka ura nke onye nāla ọlu ubi bu, ma ọ bu ihe ntà ma-ọbu ihe riri nne ka o nēri: ma afọ-ojuju nke ọgaranya adighi-ekwe ya araru ura. Ihe ọjọ nke nēb͕u di nke m'huworo n'okpuru anyanwu, bú àkù nke onye-nwe-ya nēdebe imejọ onwe-ya: àkù ahu we la n'iyì site na nweda-n'ala ọjọ; ọ buru kwa na ọ muwo nwa-nwoke, ọ dighi ihe ọ bula di ya n'aka. Dika o siri n'afọ nne-ya puta, puta n'ọtọ, out a ka ogālaghachi di ka ila dika o siri bia, ma ọ dighi ihe ọ bula o gēburu site na ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, nke ọ gēwere n'aka-ya la. Nka bu kwa ihe ọjọ nēb͕u nb͕u, na n'ihe nile dika o siri bia, otú a ka ọ gāla: ọ̀ bu kwa ole ihe fọduru ya na ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu inwe ifufe? Ọzọ, n'ubọchi-ya nile ọ bu n'ọchichiri ka o nēri ihe, anākpasu kwa ya iwe ri nne, o nwe-kwa-ra ọria na iwe. Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya. Ọzọ, madu ọ bula nke Chineke nyeworo àkù na ihe-nkpakọta, onye O mewo-kwa-ra ka o nwe ike iri nime ya, na ibūru òkè-ya, na iṅuri ọṅu nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu; nka bu onyinye Chineke. N'ihi na ọ gaghi-echeta ubọchi nile nke ndu-ya ri nne; n'ihi na Chineke nāza ya n'ọṅù obi-ya.