Logò Ngwá Baịbụl
Akara Eji Eme Ọchịchọ

EKLISIASTIS 4:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

EKLISIASTIS 4:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Mu onwem we legharia anya bu nmeb͕u nile anēmeb͕u n'okpuru anyanwu: ma, le, anya-miri nke ndi anēmeb͕u, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere; ma n'akuku ndi nēmeb͕u ha ka ike di, ma ọ dighi onye-nkasi-obi ha nwere. Mu onwem we ja ndi nwuru anwu, bú ndi nwuru anwu na mb͕e di anya gara aga, kari ndi di ndu, bú ndi ahu nke nọ na ndu rue ub͕u a; e, ọ di nma kari ha abua, bú onye akādighi, nke nāhughi ọlu ọjọ nke aluworo n'okpuru anyanwu. Mu onwem we hu ndọb͕u nile madu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu, ya na ọlu nile nāgafe agafe, na ọ bu n'ihi nka ka madu gābu onye madu-ibe-ya gēkwoso ekworo. Nka bu kwa ihe-efu na ichọ ijide ifufe.

EKLISIASTIS 4:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ọzọ, ahụrụ m mmegbu na obi ilu niile dị nʼokpuru anyanwụ, anya mmiri akwa ndị a na-emegbu emegbu, ma ọ dịkwaghị ndị nkasiobi ha nwere, ma ike dị nʼaka ndị mmegbu a, ma ha enwekwaghị ndị nkasiobi. Nʼihi ya, ekwuru m, na ndị nwụrụ anwụ, bụ ndị nwụrụ anwụ mgbe gara aga, ka ndị dị ndụ mma, bụ ndị nke dị ndụ ruo ugbu a. Ma ọ dị mma karịa ha abụọ bụ onye ahụ a na-amụbeghị, onye na-ahụbeghị ihe ọjọọ nke dị nʼokpuru anyanwụ. Achọpụtakwara m na ihe mere ndị mmadụ ji na-adọgbu onwe ha nʼọrụ bụ nʼihi anya ụfụ ha nwere nʼebe ihe ndị agbataobi ha dị. Nke a bụ ihe efu, ịchụso ifufe.