EKLISIASTIS 3:1-15
EKLISIASTIS 3:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe. Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu, oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi, oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu, oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ, oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi, oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu, oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo. Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ? Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke. O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ. Nʼihi ya, ekpebiri m na ihe dịịrị mmadụ ịchọ bụ obi ụtọ na inwe aṅụrị na ndụ ya niile. Ihe ọzọ bụ ka mmadụ rie, ṅụọ, ma nwee afọ ojuju na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya, nʼihi na ha bụ onyinye si nʼaka Chineke. Amaara m na ihe niile Chineke mere na-adịgidekwa. O nweghị ihe apụrụ itinye na ya, o nweghịkwa ihe apụrụ iwepụkwa site na ya. Chineke na-eme nke a ka ndị mmadụ tụọ egwu ya. Ihe ọbụla dị ugbu a, adịlarị na mgbe ochie, ihe ọbụla gaje ịdị dịlarị na mbụ. Chineke na-eme ka ihe niile mere na mgbe gara aga megharịakwa ọzọ.
EKLISIASTIS 3:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n'okpuru elu-igwe: mb͕e imu nwa, na mb͕e inwu anwu; mb͕e iku ihe n'ubi, na mb͕e iropu ihe akuru; mb͕e ib͕u eb͕u, na mb͕e igwọ ọria; mb͕e itikpọ etikpọ, na mb͕e iwu ulo; mb͕e ikwa ákwá, na mb͕e ichì ọchì; mb͕e iru újú, na mb͕e ite egwú; mb͕e itufu nkume, na mb͕e itukọba nkume; mb͕e ib͕aku, na mb͕e inọrọ nb͕aku n'ebe di anya; mb͕e ichọ achọ, na mb͕e ime ka ihe la n'iyì; mb͕e idebe edebe, na mb͕e itufu etufu; mb͕e idọwa adọwa, na mb͕e idukọta adukọta; mb͕e ib͕a nkiti, na mb͕e ikwu okwu; mb͕e ihu n'anya, na mb͕e ikpọ asì; mb͕e agha, na mb͕e udo. Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n'ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya? Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya. Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu. Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya. Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu. Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya. Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu.