Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 32:1-20

DEUTERONOMI 32:1-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu! Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ. Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta. Aga m eto aha ONYENWE ANYị toonu ịdị ukwuu Chineke anyị! Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ. Ha emerụọla onwe ha, ha abụkwaghị ụmụ ya, ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ndị ụdịdị ha gbanwere agbanwe Ọ bụ otu a ka unu si emeso ONYENWE ANYị unu ndị nzuzu, ndị na-enweghị uche? ONYENWE ANYị ọ bụghị nna unu, onye kere unu, onye kpụrụ unu mee ka unu guzosie ike? Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya. Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị. Nʼihi na oke ONYENWE ANYị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya. Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya, dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya, ONYENWE ANYị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya. O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị. Ma Jeshurun mara abụba, ma gbagharịa ụkwụ ya, ebe nri juru ya ọnụ, o buru ibu, maa mma ile anya. Ọ hapụrụ Chineke kpụrụ ya, jụ oke nkume ahụ, bụ Onye Nzọpụta ya. Ha sitere na chi ndị ala ọzọ ha kpasuo ekworo ya, meekwa ka iwe wee ya nʼihi ihe arụ nke arụsị ha. Ha chụrụ aja nye ụmụ mmụọ, ndị na-abụghị Chineke, bụ chi ndị ha na-amaghị, chi ndị ka pụtara ọhụrụ, chi ndị ahụ nna nna ha na-atụghị ụjọ ha. Ị gbakụtara Oke Nkume ahụ mụrụ gị azụ, i chefuru Chineke ahụ mụrụ gị. ONYENWE ANYị hụrụ ihe dị otu a, jụ ha, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom kpasuru ya iwe. “Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.

DEUTERONOMI 32:1-20 Bible Nso (IGBOB)

Ṅanu nti, unu elu-igwe, ka m'kwu kwa ihe; Ka uwa nu kwa okwu ọnum: Nmutam gātasi dika miri-ozuzo, Okwu-ọnum ganēruputa dika igirigi; Dika nshansha-miri n'elu ahihia ndu, Di kwa ka oké miri-ozuzo n'elu ihe-ọkukú: N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku. Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu: N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi: Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu. Ha ebibiwo onwe-ha, ọ bughi nke umu-Ya ka ọlu nke di ha n'aru bu. Ha bu ọb͕ọ b͕agọrọ ab͕agọ nke rọ-kwa-ra arọ. Ùnu nēnyeghachi Jehova otú a, Unu ndi-nzuzu ndi nāmaghi ihe? Ọ̀ bughi ya onwe-ya bu nna-gi onye nwetaworo gi? Ya onwe-ya emewo gi, me kwa ka i guzosie ike. Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi. Mb͕e Onye kachasi ihe nile elu mere ka mba nile keta ihe-ha, Mb͕e O kesara umu madu, O guzoro ókè nile nke ndi nile Dika ọnu-ọgugu umu Israel si di. N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya. Ọ chọtara ya n'ala ọzara, Na n'ihe tọb͕ọrọ nkití, bú ala tọb͕ọrọ n'efu nke nāb͕ọ uja. Ọ nāb͕a ya buruburu, Ọ nēme ka ọ ghọta ihe, Ọ nēchezi ya dika nwantanta anya-Ya: Dika ugo nākpọte umu di n'akwu-ya, Nērughari n'elu umu-ya, Nāb͕asa nkù-ya, nāghọrọ ha, Nēbu ha n'elu nkù-ya: Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya, Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya. Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú; Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine. Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu. Ha nēwere ndi ala ọzọ me ka O kwo ekworo, Ha nēwere ihe-árú di iche iche kpasue Ya iwe. Ha nāchuru ndi-mọ ọjọ aja, ndi nābughi Chineke, Bú chi ha nāmaghi, Ndi ọhu ndi si n'ebe di nso bata, Ndi nna-unu-hà nātughi ujọ. Oké Nkume ahu nke muru gi ka i nēchefu, I chezọwo kwa Chineke nke muputara gi. Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom. O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ, M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha: N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu, Umu ndi nēkwesighi okwukwe.