Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 16:19 - Compare All Versions

DEUTERONOMI 16:19 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ekpekwala ikpe aghụghọ, maọbụ kpee ikpe ile mmadụ anya nʼihu. Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka anya onye amamihe kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ.

DEUTERONOMI 16:19 IGBOB (Bible Nso)

Ewezugala ikpé; amatala iru madu n'ikpé: anara-kwa-la ihe-iri-ngo; n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka anya ndi mara ihe kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu nile nke ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.