Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 1:30-31 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

DEUTERONOMI 1:30-31 IGBOB (Bible Nso)

Jehova, bú Chineke-unu, Onye nēje n'iru unu, Ya onwe-ya gēburu unu agha, dika ihe nile si di nke O mere bayere unu n'Ijipt n'anya-unu; na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.

DEUTERONOMI 1:30-31 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

ONYENWE ANYị Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu ONYENWE ANYị Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.”