DEUTERONOMI 1:16-17
DEUTERONOMI 1:16-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya.
DEUTERONOMI 1:16-17 Bible Nso (IGBOB)
M'we nye ndi-ikpe-unu iwu na mb͕e ahu, si, Nānunu ikpé n'etiti umu-nne-unu, nēkpe-kwa-nu ikpe ezi omume n'etiti nwoke na nwa-nne-ya na ọbìa-ya. Unu amatala iru madu n'ikpé; unu gānu ikpé onye ntà na ikpé onye uku n'otù uzọ ahu; unu atula iru madu ujọ; n'ihi na ikpé ahu, ọ bu Chineke nwe ya: ma okwu nke sikari unu ike, unu gēweta ya nsom, m'gānu kwa ya.