DANIEL 7:1-14
DANIEL 7:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼafọ mbụ, mgbe Belshaza bidoro ịchị ala Babilọn, Daniel rọrọ nrọ, hụkwa ọhụ dị iche iche, o dere ihe ndị ahụ nʼakwụkwọ. “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri. Anụ ọhịa anọ buru ibu si nʼime osimiri ahụ rịpụta. O nweghị nke yiri ibe ya. “Nke mbụ dị ka ọdụm, kama o nwere nku dịka ugo. Mgbe m nọ na-ele ya anya, a nyakapụrụ nku ya, welie ya, hapụ ya ka o guzo nʼelu ala nʼụkwụ ya abụọ dịka mmadụ. E nyekwara ya ụdị obi nke mmadụ nwere. “Anụ ọhịa nke abụọ yiri anụ ọhịa buru ibu a na-akpọ bịa (nʼasụsụ bekee). E weliri ya nʼotu akụkụ, ọ kpụkwa ọgịrịga atọ nʼọnụ ya, nʼetiti eze ya. A gwara ya, ‘Bilie, rie anụ ka o si dị gị mma.’ “Mgbe nke a gasịrị, ka m nọ na-ele anya, anụ ndọgbu ọzọ pụtara, anụ ọhịa ahụ yiri agụ, ma o nwere nʼazụ ya nku anọ dịka nke nnụnụ. O nwekwara isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. “Mgbe nke a gasịrị, nʼime ọhụ nke abalị, ahụrụ m anụ ọhịa nke anọ. Anụ ọhịa a na-eyi oke egwu, ọnụ apụghị ịkọwa ihe o yiri. Ọ bụkwa anụ ọhịa dị nnọọ ike, nke na-eji eze igwe ya dị ukwuu na-adọwasị ma na-etipịasịkwa ihe ọbụla, nke na-ejikwa ụkwụ ya azọgbu ihe ọbụla fọdụrụ. Ọ bụ anụ ọhịa gbara iche site nʼanụ ọhịa ndị ọzọ, bụrụkwa anụ nwere mpi iri. “Mgbe m nọ na-eche banyere mpi ndị a, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwa nʼetiti ha pupụta. E si nʼukwu hopu mpi atọ nʼime mpi iri mbụ ahụ nʼihu ya. Mpi ntakịrị a nwere anya dịka mmadụ, na ọnụ na-ekwu okwu jupụtara nʼịnya isi. “Anọkwa m na-ele anya “hụ ka e doziri ocheeze, ebe Onye ahụ na-adị site na mbụ nọdụrụ. Uwe o yi na-acha nnọọ ezi ọcha dịka snoo, agịrị isi dị ya nʼisi na-acha ọcha dị ka ezi ogho ọcha. Ocheeze ya na-enwu ka ire ọkụ, ụkwụ igwe ya niile na-acha ọkụ. Iyi na-asọ ka ọkụ si nʼihu ya na-asọpụta. Puku kwụrụ puku na-agara ya ozi. Otu a kwa, nde kwụrụ nde ndị mmadụ guzo nʼihu ya. Ndị ikpe nọdụrụ ala, asaghekwara akwụkwọ dị iche iche. “Mgbe m nọ na-ele anya, nʼihi okwu ịnya isi nke mpi ahụ na-ekwu, elegidere m anya tutu ruo mgbe e gburu anụ ọhịa ahụ, laa anụ ahụ ya nʼiyi, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. (Gbasara ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa nʼihu nwantakịrị oge). “Nʼime ọhụ m nʼabalị, a hụrụ onye yiri nwa nke mmadụ, ka ọ nọ na-abịa nʼigwe ojii nke eluigwe. Onye a bịara nso nʼebe onye ahụ na-adị site na mbụ nọ. E dubatakwara ya nʼihu ya. E nyere ya ike ọchịchị, ebube na ike ịbụ eze; mba niile dị iche iche na ndị niile na-asụ asụsụ dị iche iche kpọrọ isiala nye ya. Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adị ruo mgbe ebighị ebi, nke na-agaghị agabiga. O nwekwaghị onye nwere ike ịkwatu alaeze ya.
DANIEL 7:1-14 Bible Nso (IGBOB)
N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru. Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike. Anu anọ nke di uku we nēsi n'oké osimiri rigoputa, ha di iche otù n'ibe-ya. Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya. Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu. Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n'azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi. Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri. Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche. Anọm nāhu rue mb͕e atudasari oche-eze di iche iche, otù Onye ochie we nọdu ala: uwe-Ya di ọcha dika snow, agiri-isi nke isi-Ya di kwa ka aji-anu nwupuru enwupu; oche-eze-Ya bu ire ọku ire ọku, wheel-Ya nile bu ọku nēre ere. Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche. Anọm nāhu na mb͕e ahu n'ihi olu nke oké okwu nile nke mpi nēkwu: anọm nāhu rue mb͕e eb͕uru anu ahu, la aru-ya n'iyì, rara ya nye nsure-ọku. Ma anu atọ nke fọduru, emere ka ọchichi-ha gabiga: ma ogologo mb͕e na ndu-ha ka enyere ha rue mb͕e akara àkà na mb͕e. Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya. Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.