DANIEL 3:23-25
DANIEL 3:23-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?” Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.”
DANIEL 3:23-25 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom atọ ndia, bú Shedrak na Mishak na Abed-nego, we da n'ala n'ab͕u n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu. Mb͕e ahu o juru Nebukadneza, bú eze, anya, o we were ọsọ bilie: ọ zara, si ndi-ndum-ọdu-ya, Ọ bughi ndikom atọ ekere ab͕u ayi tubàra n'etiti ọku ahu? Ha zara, si eze, Ọ bu ezie, eze. Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya.