DANIEL 2:20-22
DANIEL 2:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Daniel sịrị, “Otuto dịrị aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi; amamihe na ike dị nʼaka ya. Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. Ọ na-ekpughe ihe dị omimi na ihe zoro ezo; Ọ maara ihe dị nʼọchịchịrị, ma ìhè binyekwara ya.
DANIEL 2:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu: ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma: Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ.