EMOS 2:1-3
EMOS 2:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka ONYENWE ANYị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ. Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ ONYENWE ANYị na-ekwu.
EMOS 2:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu: ma M'gēzite ọku na Moab, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Keriot; Moab gānwu kwa anwu na nkpọtu, na n'iti-nkpu agha, na n'olu opì-ike: M'gēbipu kwa onye-ikpe n'etiti ya, b͕ue ya na ndi-isi-ya nile; otú a ka Jehova siri.